35 Jonadab we si eze, Le, umu-ndikom eze abiawo: dika okwu orù-gi kwuru, otú a ka ọ di.
36 O rue na, mb͕e o kwubìri okwu, le, umu-ndikom eze biara, welie olu-ha, kwa ákwá: ọzọ kwa eze na ndi-orù-ya nile kwara ákwá di uku ri nne.
37 Ma Absalom b͕alagara jekuru Talmai nwa Amihua, eze Geshua. Devid we nēru újú nwa-ya ubọchi nile.
38 Absalom we b͕alaga, jerue Geshua, nọ n'ebe ahu arọ atọ.
39 Agu nāgusi nkpuru-obi Devid, bú eze, ike ipukuru Absalom: n'ihi na akasiri ya obi bayere Amnon, n'ihi na ọ nwuwo.