5 Jonadab we si ya, Dinakwasi n'ihe-ndina-gi, me onwe-gi onye aru nādighi ike: ma mb͕e nna-gi batara ihu gi, i gāsi ya, Biko, ka Tema, bú nwa-nnem, bata, ka o me kwa ka m'rie nri, ka o dozi kwa ihe-oriri ahu n'anyam, ka m'we hu ya, rie ya n'aka-ya.
6 Amnon we dina, mee onwe-ya onye aru nādighi ike: eze we bata ihu-ya, Amnon we si eze, Biko, ka Tema, bú nwa-nnem, bata, me achicha abua n'anyam, ka m'we rie ha n'aka-ya
7 Devid we zigara Tema ozi n'ulo, si, Biko, je n'ulo Amnon nwa-nne-gi, doziere ya ihe-oriri.
8 Tema we je n'ulo Amnon nwa-nne-ya; ma onye ahu nēdina edina. O we were utu ọka flour agwọrọ agwọ, gwọ ya, me achicha n'anya-ya, sie achicha ahu.
9 O were ite, wupu ha n'iru ya; ma ọ juru iri ha. Amnon we si, Me ka madu ọ bula si n'ebe m'nọ pua. Ha we pua, madu ọ bula, n'ebe ọ nọ.
10 Amnon we si Tema, Bubata ihe-oriri n'ime-ulo, ka m'we rie ya n'aka-gi. Tema we chiri achicha nke o mere, chitara Amnon nwa-nne-ya n'ime-ulo.
11 Ọ chita ha nso ya ka o rie, Amnon we jide ya, si ya, Bia, sorom dina, nwa-nnem.