8 Tema we je n'ulo Amnon nwa-nne-ya; ma onye ahu nēdina edina. O we were utu ọka flour agwọrọ agwọ, gwọ ya, me achicha n'anya-ya, sie achicha ahu.
9 O were ite, wupu ha n'iru ya; ma ọ juru iri ha. Amnon we si, Me ka madu ọ bula si n'ebe m'nọ pua. Ha we pua, madu ọ bula, n'ebe ọ nọ.
10 Amnon we si Tema, Bubata ihe-oriri n'ime-ulo, ka m'we rie ya n'aka-gi. Tema we chiri achicha nke o mere, chitara Amnon nwa-nne-ya n'ime-ulo.
11 Ọ chita ha nso ya ka o rie, Amnon we jide ya, si ya, Bia, sorom dina, nwa-nnem.
12 Ọ si ya, É-è nwa-nnem, ewedalam n'ala; n'ihi na adighi-eme otú a n'Israel: emela ihe-nzuzu a.
13 Ma mu onwem, òle ebe m'gēme ka ita-utam la? ma gi onwe-gi, i gādi ka otù onye nime ndi-nzuzu n'israel. Ma ub͕u a, biko, gwa eze okwu; n'ihi na ọ gaghi-eb͕ochim n'ebe i nọ.
14 Ma ọ kweghi ige nti olu-ya: ọ di kwa ike kari ya, ọ we weda ya n'ala, soro ya dina.