12 Nwayi ahu we si, Biko, ka nwayi nējere gi ozi gwa onye-nwem, bú eze, okwu. Ọ si, kwue.
13 Nwayi ahu we si, Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka i chère ihe di otú a megide ndi Chineke? n'ihi na eze nēkwu okwu a dika onye ikpe mara, ebe eze nādighi-eme ka onye nke ya achupuru achupu lata.
14 N'ihi na ayi aghaghi inwu, ayi di kwa ka miri nke anāwusi n'ala, nke anāgaghi-achikọta; ma Chineke ewepughi ndu, kama Ọ nēchè èchìchè, ka onye achupuru achupu we ghara ibu onye achupuru n'ebe Ọ nọ.
15 Ma ub͕u a, ebe m'biaworo igwa eze, bú onye nwem, okwu a, ọ bu n'ihi na ndim emewo ka m'tua egwu; nwayi nējere gi ozi we si, Biko, ka m'gwa eze okwu; eleghi anya eze gēme okwu nke orù-ya nwayi.
16 N'ihi na eze gānu, inaputa orù-ya nwayi n'ọbu-aka nwoke nāchọ ikpochapu mu na nwam nwoke n'otù n'ihe-nketa Chineke.
17 Nwayi nējere gi ozi we si, Biko, ka okwu onye-nwem, bú eze, diri izu-ike: n'ihi na dika mọ-ozi nke Chineke, otú a ka onye-nwem, bú eze, di inu ezi ihe na ihe ọjọ: Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi.
18 Eze we za, si nwayi ahu, Biko, ezonarilam okwu nke mu onwem nāju gi. Nwayi ahu we si, Biko, ka onye-nwem, bú eze, kwue.