24 Eze we si, Ka o chigharia la n'ulo-ya, ma ọ gaghi-ahu irum anya. Absalom we chigharia la n'ulo-ya, ma ọ hughi iru eze.
25 Ma n'Israel nile ọ dighi nwoke mara nma dika Absalom anētò nke-uku: site n'ọbu-ukwu-ya we rue opu-n'isi-ya ọlu adighi n'aru-ya.
26 Ma mb͕e ọ kọpuru isi-ya, (n'ihi na ọ bu n'ogwugwu arọ n'ọgwugwu arọ ka ọ nākọpu ya: n'ihi na agiri-isi di arọ́ n'isi-ya, o we kọpu ya:) o we tua agiri-isi di n'isi-ya ọgu shekel iri, n'ihe-ọtùtù eze.
27 Ewe muara Absalom umu-ndikom atọ, na otù nwa-nwayi, aha-ya bu Tema: onye ahu bu nwayi mara nma ile anya.
28 Absalom we biri na Jerusalem arọ abua zuru ezu; ma ọ hughi iru eze.
29 Absalom we zigara Joab ozi, iziga ya jekuru eze; ma o kweghi ibiakute ya: O we ziga ọzọ nke ub͕ò abua, ma ọ kweghi ibia.
30 O we si ndi-orù-ya, Lenu, òkè ala-ubi Joab di n'akuku alam, o nwe-kwa-ra ọka barley n'ebe ahu: jenu, sue ya ọku. Ndi-orù Absalom we sue òkè ala-ubi ahu ọku.