9 Nwayi Tekoa ahu we si eze, N'isim, onye-nwem, eze, ka ajọ omume a di, na n'isi ulo nnam: ma ka eze na oche-eze-ya buru ndi ikpe nāmaghi.
10 Eze we si, Onye nāgwa gi okwu, me ka ọ biakutem, ọ gaghi-emetu kwa gi aka ọzọ.
11 Nwayi ahu we si, Biko, ka eze cheta Jehova, bú Chineke-gi, ka onye-ọ́bọ̀ ọbara ghara ibibi nke-uku, ka ha we ghara ikpochapu nwam nwoke. Devid we si, Jehova nādi ndu, ọ dighi otù nime agiri-isi nwa-gi gāda n'ala.
12 Nwayi ahu we si, Biko, ka nwayi nējere gi ozi gwa onye-nwem, bú eze, okwu. Ọ si, kwue.
13 Nwayi ahu we si, Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka i chère ihe di otú a megide ndi Chineke? n'ihi na eze nēkwu okwu a dika onye ikpe mara, ebe eze nādighi-eme ka onye nke ya achupuru achupu lata.
14 N'ihi na ayi aghaghi inwu, ayi di kwa ka miri nke anāwusi n'ala, nke anāgaghi-achikọta; ma Chineke ewepughi ndu, kama Ọ nēchè èchìchè, ka onye achupuru achupu we ghara ibu onye achupuru n'ebe Ọ nọ.
15 Ma ub͕u a, ebe m'biaworo igwa eze, bú onye nwem, okwu a, ọ bu n'ihi na ndim emewo ka m'tua egwu; nwayi nējere gi ozi we si, Biko, ka m'gwa eze okwu; eleghi anya eze gēme okwu nke orù-ya nwayi.