23 Ala ahu nile nākwa ákwá n'oké olu, ndi ahu nile nāgabiga kwa: eze nāgabiga kwa miri-iyi Kidron, ndi-ya nile nāgabiga kwa, n'iru uzọ ọzara.
24 Ma, le, Zedok bia-kwa-ra, ya na ndi Livai nile, nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Chineke; ha we dọba ib͕e Chineke, Abaiata we rigo, rue mb͕e ndi ahu nile siri n'obodo gabigasia.
25 Eze we si Zedok Bughachi ib͕e Chineke n'obodo; o buru na ahutam amara n'iru Jehova, Ọ gēweghachim, me ka m'hu ya na ebe-obibi-Ya:
26 ma ọ buru na Ọ si otú a, Ihe-gi atọghm utọ; lem, Ya mem otú ọ di nma n'anya-Ya.
27 Eze we si Zedok, bú onye-nchu-àjà, Ọ̀ bughi onye-ọhu-uzọ ka i bu? laghachi n'obodo n'udo, unu na Ahimaaz nwa-gi, na Jonatan nwa Abaiata, bú umu-unu abua.
28 Lenu, mu onwem ganānọgide na ngabiga-miri nke ọzara, rue mb͕e okwu gēsi n'ebe unu nọ bia igosim ka ihe si di.
29 Zedok na Abaiata we bughachi ib͕e Chineke na Jerusalem: ha we nọdu n'ebe ahu.