1 Ahitofel we si Absalom, Biko, ka m'rọputa orú nnù ndikom na nnù iri, bilie, chua Devid n'azu n'abali a:
2 m'gābiakwasi kwa ya mb͕e ike gwuru ya onwe-ya, na mb͕e aka-ya nādighi ike, m'gēme kwa ka ọ ma jijiji: ndi nile ndi ya na ha nọ gāb͕alaga kwa; m'gētib͕u kwa eze, nání ya:
3 m'gēme kwa ka ndi-ya nile laghachikute gi: dika nlaghachi madu nile ka nwoke ahu bu, onye gi onwe-gi nāchọ: ndi Israel nile gānọ n'udi.
4 Okwu ahu ziri ezi n'anya Absalom na n'anya ndi-okenye nile nke Israel.
5 Absalom we si, Biko, kpọ kwa Hushai, bú onye-Akait, ka ayi nuru kwa ihe di kwa n'ọnu ya onwe-ya.
6 Hushai we biakute Absalom, Absalom we gwa ya okwu, si, Dika okwu a si di ka Ahitofel kwuru: àyi gēme ihe o kwuru? ọ buru na ayi agaghi-eme ya, gi onwe-gi kwue.