10 Ma Absalom, onye ayi tere manu ibu isi-ayi, anwuwo n'agha. Ma ub͕u a n'ihi gini ka unu onwe-unu nādighi-ekwu ime ka eze lata?
11 Eze, bú Devid, we zigara Zedok na Abaiata, bú ndi-nchu-àjà, ozi, si, Gwanu ndi-okenye Juda okwu, si, N'ìhi gini ka unu bu ndi-ikpe-azu ime ka eze lata n'ulo-ya? ma okwu Israel nile abiaruwo eze nti, ime ka ọ lata n'ulo-ya?
12 Umu-nnem ka unu bu, ọkpukpum na anu-arum ka unu bu: n'ìhi gini kwa ka unu bu ndi-ikpe-azu ime ka eze lata?
13 Amasa ka unu gāsi kwa, Ọ̀ bughi ọkpukpum na anu-arum ka i bu? Chineke mem otú a, mekwam ihe ọzọ otú a, ma ọ buru na i ghọghi onye-isi usu-ndi-agha n'irum ubọchi nile n'ọnọdu Joab.
14 O we me ka obi ndikom nile nke Juda rulata, dika otù nwoke; ha we zigara eze ozi, si, Lata, gi onwe-gi na ndi-orù-gi nile.
15 Eze we lata, bia rue Jọdan. Juda we biarue Gilgal, ije izute eze, ime ka eze gabiga Jọdan.
16 Shimai nwa Gira, bú onye Benjamin, nke sitere na Bahurim, we me ngwa soro ndikom Juda ridata izute eze, bú Devid.