15 Eze we lata, bia rue Jọdan. Juda we biarue Gilgal, ije izute eze, ime ka eze gabiga Jọdan.
16 Shimai nwa Gira, bú onye Benjamin, nke sitere na Bahurim, we me ngwa soro ndikom Juda ridata izute eze, bú Devid.
17 Nnù ndikom abua na ọgu iri so-kwa-ra ya site na Benjamin; Ziba kwa, onye nējere ulo Sọl ozi, ya na umu-ya ndikom iri na ise na orú ndi-orú-ya; ha we jisie ike gabiga Jọdan n'iru eze.
18 Ma ub͕o-nwebiga gabigara iwebiga ndi ulo eze, na ime ihe di nma n'anya-ya. Shimai nwa Gira we da n'iru eze, mb͕e ọ gabigara Jọdan.
19 Ọ si eze, Ka onye-nwem ghara igu ajọ omume nyem, echeta-kwa-la ihe orù-gi mere n'ajọ omume n'ubọchi onye-nwem, bú eze, siri na Jerusalem pua, ka eze we tiye ya n'obi-ya.
20 N'ihi na orù-gi amawo na mu onwem emehiewo: ma, le, abiawom ta, buru ulo nile nke Josef uzọ irida izute onye-nwem, bú eze.
21 Abishai nwa Zeruaia we za, si, Àgaghi-eme ka Shimai nwua n'ihi nka, n'ihi na ọ kọchara onye Jehova etere manu?