20 N'ihi na orù-gi amawo na mu onwem emehiewo: ma, le, abiawom ta, buru ulo nile nke Josef uzọ irida izute onye-nwem, bú eze.
21 Abishai nwa Zeruaia we za, si, Àgaghi-eme ka Shimai nwua n'ihi nka, n'ihi na ọ kọchara onye Jehova etere manu?
22 Devid we si, Gini ka mu na unu nwekọrọ, umu-ndikom Zeruaia, na unu gāburum onye-nmegide ta? àgēme ka nwoke ọ bula nwua n'Israel ta? n'ihi na ọ̀ bu na amaghm na ta ka mu onwem bu eze Israel?
23 Eze we si Shimai, I gaghi-anwu. Eze we ṅuara ya iyi.
24 Mefiboshet nwa Sọl rida-kwa-ra izute eze; ma o dozighi ukwu-ya, o dozighi kwa afu-ọnu-ya, ọ sughi kwa uwe-ya miri, site n'ubọchi eze jere rue ubọchi mb͕e ọ bia-kwa-ra n'udo.
25 O rue, mb͕e ọ biaruru Jerusalem izute eze, na eze siri ya, N'ìhi gini ka i nēsoghm je, Mefiboshet?
26 Ọ si, Onye-nwem, eze, orùm ghọb͕urum: n'ihi na orù-gi siri, Ka m'jikwara onwem inyinya-ibu, ka m'we nọkwasi ya, soro eze je; n'ihi na orù-gi dara ngwurọ.