32 Ma Bazilai mere agadi nke-uku, ọ b͕ara ọgu arọ anọ: ya onwe-ya zù-kwa-ra eze mb͕e ọ nānọdu na Mahanaim; n'ihi na oké madu ka ọ bu nke-uku.
33 Eze we si Bazilai, Gi onwe-gi sorom gabiga, m'gāzù kwa gi n'ebe m'nọ na Jerusalem.
34 Bazilai we si eze, Ùbọchi arọ nke ndum di ole, m'gēji soro eze rigorue Jerusalem?
35 Ọgu arọ anọ ka m'b͕ara ta: m'gāmara ihe di iche n'etiti ezi ihe na ihe ọjọ? òrù-gi gāmata utọ ihe m'nēri ma-ọbu nke m'nāṅu? m'gēge nti ọzọ n'olu ndikom nābu abù na ndinyom nābu abù? n'ihi gini kwa ka orù-gi gāburu onye-nwem, bú eze, ibu ọzọ?
36 Dika ihe ntà orù-gi nēso eze gabiga Jọdan: n'ìhi gini kwa ka eze gēnyeghachim ihe-nnyeghachi a?
37 Biko, ka orù-gi laghachi, ka m'we nwua n'obodom, n'akuku ílì nnam na nnem. Ma, le, orù-gi, bú Kimham; ya soro onye-nwem, bú eze, gabiga; gi me-kwa-ra ya ihe di nma n'anya-gi.
38 Eze we si, Kimham gēsom gabiga, mu onwem gēme-kwa-ra ya ihe di nma n'anya-gi: ma ihe ọ bula i gārọputa ka m'mere gi, m'gēmere gi ya.