23 Ma ọ juru iwezuga onwe-ya: Abnea we were isi ube-ya tie ya n'okpuru ọgiriga-ya nke-ise, ube we puta n'azu ya, o we da n'ebe ahu, nwua n'okpuru ya: o rue, na ndi nile ndi biaruru ebe ahu, bú ebe Asahel dara nwua, guzoro.
24 Ma Joab na Abishai churu Abnea n'azu; anyanwu we da mb͕e ndi ahu biaruru ugwu ntà Ama, nke di n'iru Gia n'uzọ ọzara Gibeon.
25 Umu Benjamin we chikọta onwe-ha iso Abnea n'azu, ha we ghọ otù usu, guzo, n'elu otù ugwu ntà.
26 Abnea we kpọ Joab òkù, si, Ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka mma-agha gēripia? ì maghi na ilu ka ọ gādi n'ikpe-azu? rù kwa ole mb͕e ka i nāgaghi-asi ndi-gi ka ha si n'iso umu-nne-ha laghachi?
27 Joab we si, Chineke nādi ndu, ọ buru na i kwughi, n'ezie mb͕e ahu site n'ututu ndim gārigowori, nwoke ọ bula site n'iso nwa-nne-ya.
28 Joab we fùa opì-ike, ndi-ya nile we guzo, ha achughi kwa Israel n'azu ọzọ, ha ebughi kwa agha ọzọ.
29 Ma Abnea na ndikom-ya jere ije n'Araba abali ahu nile; ha we gabiga Jọdan, je ije na Bitron nile, bia rue Mahanaim.