3 Ndikom ndi ya na ha nọ ka Devid me-kwa-ra ka ha rigota, nwoke ọ bula na ulo-ya: ha we biri n'obodo nile nke Hebron.
4 Ndikom Juda we bia te Devid manu n'ebe ahu ibu eze ulo Juda.Ha we gosi Devid, si, Ndikom Jebesh-gilead bu ndi lìri Sọl.
5 Devid we zigara ndikom Jebesh-gilead ndi-ozi, si, ha, Ndi agọziri agọzi diri Jehova ka unu bu, na unu emeworo onye-nwe-unu, bú Sọl, ebere a, unu we líe-ya.
6 Ma ub͕u a Jehova mere unu ebere na ezi-okwu: ọzọ kwa, mu onwem gēmeghachiri unu ezi ihe a, n'ihi na unu emewo ihe a.
7 Ma ub͕u a ka aka-unu di ike, buru-kwa-nu ndi-dinkpà: n'ihi na onye-nwe-unu, bú Sọl, anwuwo; ọzọ kwa, mu ka ulo Juda teworo manu ibu eze-ha.
8 Ma Abnea nwa Nea, bú onye-isi usu-ndi-agha Sọl nwere, kuru Ish-boshet nwa Sọl, me ka ọ gabiga rue Mahanaim;
9 o we me ya eze Gilead, na nke ndi-Ashurait, na nke Jezreel, na nke Efraim, na nke Benjamin, na nke Israel nile.