1 Ma ọ dabatara otù nwoke jọb͕uru onwe-ya inọ n'ebe ahu, aha-ya bu Sheba, nwa Bikri, onye Benjamin: o we fùa opì-ike, si, Ayi enweghi òkè nime Devid, ayi enweghi kwa ihe-nketa nime nwa Jesi: nwoke ọ bula, ya la n'ulo-ikwū-ya, Israel.
2 Ndikom nile nke Israel we si n'iso Devid rigo, so Sheba nwa Bikri: ma ndikom Juda rapara n'aru eze-ha, site na Jọdan we rue Jerusalem.
3 Devid we biarue ulo-ya na Jerusalem; eze we chiri ndinyom iri ahu, bú ndi-iko-ya, ndi o mere ka ha nọdu iche ulo, o we tiye ha n'ulo-ndebe, nāzu ha, ma ọ bakurughi ha. Ha we buru ndi emechibidoworo uzọ rue ubọchi ọnwu-ha, nādi ndu dika ndinyom di-ha nwuru.
4 Eze we si Amasa, Kpọkọtaram ndikom Juda n'ubọchi atọ, gi onwe-gi guzo kwa n'ebe a.
5 Amasa we je ikpọkọta Juda: ma ọ nọrọ ọdù kari mb͕e akara àkà nke ọ kaworo ya.
6 Devid we si Abishai, Ub͕u a Sheba nwa Bikri gēmejọ ayi kari Absalom: gi onwe-gi chiri ndi-orù onye-mwe-gi, chua ya n'azu, ka o we ghara ichọtara onwe-ya obodo ufọdu ewusiri ike, we naputa onwe-ya n'anya-ayi.