21 Ọ bughi otú a ka okwu a di: kama otù nwoke nke sitere n'ugwu Efraim, Sheba nwa Bikri bu aha-ya, o weliri aka-ya imegide eze, bú imegide Devid: nyenum ya, nání ya, ka m'si n'obodo a la. Nwayi ahu we si Joab, Le, agātuputara gi isi-ya nime mb͕idi.
22 Nwayi ahu we biakute ndi obodo ahu nile n'amam-ihe-ya. Ha we bipu isi Sheba nwa Bikri, tupuru ya Joab. O we fùa opì-ike, ha we si n'obodo ahu b͕asa, nwoke ọ bula ọ la n'ulo-ikwū-ya. Joab we lata na Jerusalem jekuru eze.
23 Ma Joab bu onye-isi usu-ndi-agha nile nke Israel: Benaia nwa Jehoiada bu onye-isi ndi Keret, bu kwa onye-isi ndi Pelet:
24 Adoram bu onye-isi usu ndi nēfè òfùfè: Jehoshafat nwa Ahailud bu onye-ncheta:
25 Sheva bu ode-akwukwọ: Zedok na Abaiata bu ndi-nchu-àjà.
26 ọzọ kwa, Ira onye Jaia buru Devid onye-isi n'ije ozi.