25 Jehova we meghachim dika ezi omumem si di;Dika idi-ọcham n'anya-Ya si di.
26 N'ebe onye-ebere nọ I gēgosi Onwe-gi onye-ebere,N'ebe nwoke zuru okè nọ I gēgosi Onwe-gi onye zuru okè;
27 N'ebe onye di ọcha nọ I gēgosi Onwe-gi onye di ọcha;Ma n'ebe onye b͕agọro ab͕agọ nọ I gēgosi Onwe-gi Onye-nb͕á.
28 I gāzọputa kwa ndi ewedara n'ala:Ma anya-Gi abua dikwasi ndi di elu, ka I we me ka ha di ala.
29 N'ihi na Gi onwe-gi bu oriọnam, Jehova:Jehova nēme kwa ka ọchichirim nwue enwu.
30 N'ihi na m'nēsite na Gi b͕a ọsọ ichu usu ndi nāpunara madu ihe:Anamesite na Chinekem wubiga mb͕idi.
31 Chineke, uzọ-Ya zuru okè:Okwu-ọnu Jehova bu ihe anuchara anucha;Ọta ka ọ buru ndi nile nke nāb͕abà nime Ya.