29 N'ihi na Gi onwe-gi bu oriọnam, Jehova:Jehova nēme kwa ka ọchichirim nwue enwu.
30 N'ihi na m'nēsite na Gi b͕a ọsọ ichu usu ndi nāpunara madu ihe:Anamesite na Chinekem wubiga mb͕idi.
31 Chineke, uzọ-Ya zuru okè:Okwu-ọnu Jehova bu ihe anuchara anucha;Ọta ka ọ buru ndi nile nke nāb͕abà nime Ya.
32 N'ihi na ònye bu Chineke, ma-ọbughi Jehova?Ònye bu kwa oké nkume, ma-ọbughi Chineke-ayi?
33 Chineke bu ebem siri ike nke di ike nke-uku:Ọ nākwazu kwa uzọm.
34 O nēdozi ukwum ka ha di ka ukwu nne-ele:N'elu ebem di elu ka Ọ nēguzokwam.
35 O nēzí akam abua ibu agha;Ogwe-akam abua nārọgọ kwa uta ọla.