31 Chineke, uzọ-Ya zuru okè:Okwu-ọnu Jehova bu ihe anuchara anucha;Ọta ka ọ buru ndi nile nke nāb͕abà nime Ya.
32 N'ihi na ònye bu Chineke, ma-ọbughi Jehova?Ònye bu kwa oké nkume, ma-ọbughi Chineke-ayi?
33 Chineke bu ebem siri ike nke di ike nke-uku:Ọ nākwazu kwa uzọm.
34 O nēdozi ukwum ka ha di ka ukwu nne-ele:N'elu ebem di elu ka Ọ nēguzokwam.
35 O nēzí akam abua ibu agha;Ogwe-akam abua nārọgọ kwa uta ọla.
36 I nyewokwam ọta nzọputa-Gi:Ume-ala-n'obi nke Gi nēmekwam ka m'ba uba.
37 I nēme ka nzọ-ukwum sa mbara n'okpurum,Nkwonkwo-ukwum ab͕uchapughi kwa.