47 Jehova nādi ndu; Onye agọziri agọzi ka oké nkumem bu kwa;Chineke nke oké nkume nzọputam di kwa elu:
48 Bú Chineke ahu Nke nābọrọm ọ́bọ̀,Onye nēme kwa ka ndi di iche iche rida n'okpurum,
49 Onye nēme kwa ka m'si n'aka ndi-irom pua:I nēwelikwam elu kari ndi nēbili imegidem:I nānaputam n'aka madu nēme ihe ike.
50 N'ihi nka ka m'gēkele Gi, Jehova, n'etiti mba ọzọ,Aha-Gi ka m'gābùku kwa abù ọma.
51 Ọ nēme ka nzọputa eze-Ya di uku:Ọ nēme-kwa-ra onye nke Ya etere manu ebere,Bú Devid, Ọ nēme-kwa-ra nkpuru-ya ebere rue mb͕e ebighi-ebi.