14 Ma Devid nọ n'ebe ahu ewusiri ike mb͕e ahu, ma ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia di na Bet-lehem mb͕e ahu.
15 Devid we chọsie ike, si, Ònye gēme ka m'ṅua miri sitere n'olùlù-miri Bet-lehem, nke di n'ọnu-uzọ-ama:
16 Ndi-dike atọ ahu we wapue ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia, sere miri n'olùlù-miri Bet-lehem, nke di n'ọnu-uzọ-ama, ha we būru ya, kutere Devid: ma o kweghi iṅu ya, o we wusiere ya Jehova.
17 Ọ si, Ya burum ihe-árú, Jehova, ime ihe a: #m'gāṅu ọbara ndikom ahu ndi ji ndu-ha n'aka-ha nēje? o kweghi kwa iṅu ya. Ihe ndia ka ndi-dike atọ ahu mere.
18 Ma Abishai, bú nwa-nne Joab, nwa Zeruaia, onye ahu bu onye-isi ndikom atọ ahu. Onye ahu feghari-kwa-ra ube-ya imegide ọgu ndikom iri-na-ise, ha we ghọ ndi eb͕uru eb͕u, o we nwe aha n'etiti ndikom atọ ahu.
19 Àdighi-asọpuru ya kari ndikom atọ ahu? o we ghọrọ ha onye-isi: ma o rughi ndikom atọ mbu ahu.
20 Benaia kwa, nwa Jehoiada, nwa nke nwoke bu dìnkpà nke Kabzeel, onye di uku n'ime ihe, onye ahu tib͕uru umu-ndikom abua nke Ariel nke Moab: onye ahu rida-kwa-ra tib͕ue ọdum n'etiti olùlù n'ubọchi snow nēzò.