17 Dika okwu ndia nile si di, na dika ọhù a nile si di, otú a ka Netan gwara Devid okwu.
18 Eze, bú Devid, we ba, nọdu ala n'iru Jehova; ọ si, Ònye ka m'bu, Onye-nwe-ayi Jehova, gini kwa ka ulom bu, na I mewo ka m'biarue na mb͕e a?
19 Ma nka bu nání ihe ntà n'anya-Gi, Onye-nwe-ayi Jehova; I we kwu kwa okwu bayere ulo-orú-Gi rue mb͕e di anya; nka bu kwa iwu bayere madu, Onye-nwe-ayi Jehova!
20 Ma gini ka Devid gāgwa kwa Gi ọzọ? n'ihi na Gi onwe-gi mara orù-Gi, Onye-nwe-ayi Jehova.
21 N'ihi okwughi, na dika obi-Gi si di, ka I meworo ihe-idi-uku a nile, ime ka orù-Gi mara ya.
22 N'ihi nka I di uku, Onye-nwe-ayi Jehova: n'ihi na ọ dighi onye di ka Gi, ọ dighi kwa Chineke ma-ọbughi Gi, dika ihe nile si di nke ayi nuworo na nti-ayi.
23 Ma òle mba di ka ndi-Gi, dika Israel, bú otù mba nke nēguzo iche n'uwa, nke Chineke jere ib͕aputara Onwe-ya ka ọ buru otù ndi, na imere Onwe-ya aha, na imere unu ihe-idi-uku a, na imere ala-Gi ihe di egwu, n'iru ndi-Gi, nke I siri n'Ijipt, bú mba di iche iche ọzọ na chi nile ha, baputara onwe-gi?