5 Je, si orùm, bú Devid, Otú a ka Jehova siri, Ọ̀ bu gi onwe gi gēwurum ulo ibu ebe M'gēbi?
6 N'ihi na ebighm n'ulo site n'ubọchi M'mere ka umu Israel si n'Ijipt rigota, we rue ta, kama M'nējeghari n'ulo-ikwū na n'ebe-obibim.
7 N'ebe nile nke M'nējeghari n'etiti umu Israel nile, ọ̀ di okwu M'gwara otù n'ebo Israel nile, nke M'nyere iwu izù ndim, bú Israel, si, N'ìhi gini ka unu newurughm ulo cedar?
8 Ma ub͕u a, otú a ka i gāsi orùm, bú Devid, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Mu onwem siri n'ebe-ita-nri anu-ulo, si kwa n'ebe i nēso ìgwé ewu na aturu, kuru gi, ka i buru nye-ndú ndim, bú Israel:
9 M'we nọyere gi n'ebe ọ bula i jere, ebipu-kwa-ram ndi-iro-gi nile n'iru gi; M'gēme-kwa-ra gi aha uku, dika aha ndi uku ndi nọ n'uwa.
10 M'gēdo-kwa-ra ndim, bú Israel, otú ebe, ku kwa ha dika osisi, ka ha we biri n'ọnọdu-ha, ghara ima jijiji ọzọ; umu ajọ omume agaghi-eweda kwa ha ọzọ, dika na mbu,
11 na dika site n'ubọchi mb͕e M'nyere ndi-ikpe iwu ibu ndi-isi ndim, bú Israel; emewokwam ka i zuru ike pua n'aka ndi-iro-gi nile. Jehova egosiwo kwa gi na Jehova gēmere gi ulo.