9 Onye ihe-ya nātọm utọ yiri mb͕ada ma-ọbu nwa-ele:Le kwa, ọ nēguzo n'azu mb͕idi-ayi,Ọ nēsi na window nile lebata anya,Anya-ya nēsi n'oghere-inara-ifufe nwubata.
10 Onye ihe-ya nātọm utọ zara, sim,Bilie, eyìm, onye nkem nke mara nma, bia.
11 N'ihi na, le, mb͕e oyi agabigawo,Oké miri-ozuzo agawo, ọ lawo;
12 Ahuwo okoko-ọhia anya n'ala;Mb͕e abù ọma nke umu-nnunu eruwo,Anuwo kwa olu nduru n'ala-ayi;
13 Osisi fig achawo nkpuru fig-ya nāchaghi acha,Osisi vine nile nāb͕awa okoko,Ha esìpuwo ísì utọ ha.Bilie, eyìm, onye nkem nke mara nma, bia.
14 Gi ndurum, nke di na nb͕awa nkume di elu, n'ebe-nzuzo nke ebe di nkputankpu,Me ka m'hu iru-gi, me ka m'nu olu-gi;N'ihi na olu-gi nātọ utọ, iru-gi ma-kwa-ra nma.
15 Nwuderenu ayi nkita-ọhia nile, bú nkita-ọhia di ntà, ndi nēmebi ubi-vine nile;N'ihi na ubi-vine-ayi nāb͕awa okoko.