12 Ubi ab͕ara ogige nke akpachiri akpachi ka nwa-nnem nwayi, bú nwunye ọhu nkem, bu;Ebe-nsuputa-miri akpachiri akpachi, isi-iyi ab͕achiri ab͕achi.
13 Ome-gi nile bu ogige ọma nke pome-granate, nwere nkpuru di iche iche di oké ọnu-ahia;Henna, ya na osisi manu nard nile,
14 Manu nard na saffron,Calamus na cinnamon, ha na osisi nile nke frankincense;Myrrh na aloes, ha na isi uda nile.
15 Isi-iyi nke ubi nile ab͕ara ogige ka i bu,Olùlù-miri nke juputara na miri di ndu,Na miri-iyi di iche iche nke nērù erù site na Lebanon.