5 Mu onwem biliri imeghere onye ihe-ya nātọm utọ uzọ;Akam abua nābusi kwa na myrrh,Nkpisi-akam nile nābusi kwa na myrrh nērù erù,N'elu nkpisi nile nke ugodi.
6 Mu onwem meghere onye ihe-ya nātọm utọ uzọ;Ma onye ihe-ya nātọm utọ wezugarari onwe-ya, gabiga.Nkpuru-obim apuwori mb͕e o kwuru okwu:Achọrọm ya, ma Achọtaghm ya;Akpọrọm ya òkù, ma ọ zaghm.
7 Ndi-nche ndi nējeghari n'obodo buruburu hurum,Ha tirim ihe, b͕uem mma;Ndi-nche mb͕idi nile nke obodo chipuru ákwà-nb͕ochim n'arum.
8 Ab͕awom unu iyi, unu umu-ndinyom Jerusalem, ọ buru na unu ahu onye ihe-ya nātọm utọ,Gini ka unu gēgosi ya? Na onye ọria ihu-n'anya nāria ka m'bu.
9 Gini ka onye ihe-ya nātọ gi utọ bu kari onye ọzọ ihe-ya nātọ madu utọ,Gi onye mara nma n'etiti ndinyom?Gini ka ihe-ya nātọ gi utọ bu kari onye ọzọ ihe-ya nātọ madu utọ,Na i b͕awo ayi iyi otú a?
10 Onye ihe-ya nātọm utọ di ọcha nācha kwa uhie uhie,Onye emeworo ka ọ di elu dika ọkọlọtọ kari orú nnù na nnù ise.
11 Isi-ya di ka ọla-edo ọma nke anuchara anucha,Agiri-isi-ya nēruda eruda dika igu nkwu, nēji nji dika ugolo-ọma.