7 Ndi-nche ndi nējeghari n'obodo buruburu hurum,Ha tirim ihe, b͕uem mma;Ndi-nche mb͕idi nile nke obodo chipuru ákwà-nb͕ochim n'arum.
8 Ab͕awom unu iyi, unu umu-ndinyom Jerusalem, ọ buru na unu ahu onye ihe-ya nātọm utọ,Gini ka unu gēgosi ya? Na onye ọria ihu-n'anya nāria ka m'bu.
9 Gini ka onye ihe-ya nātọ gi utọ bu kari onye ọzọ ihe-ya nātọ madu utọ,Gi onye mara nma n'etiti ndinyom?Gini ka ihe-ya nātọ gi utọ bu kari onye ọzọ ihe-ya nātọ madu utọ,Na i b͕awo ayi iyi otú a?
10 Onye ihe-ya nātọm utọ di ọcha nācha kwa uhie uhie,Onye emeworo ka ọ di elu dika ọkọlọtọ kari orú nnù na nnù ise.
11 Isi-ya di ka ọla-edo ọma nke anuchara anucha,Agiri-isi-ya nēruda eruda dika igu nkwu, nēji nji dika ugolo-ọma.
12 Anya-ya abua di ka nduru n'akuku miri-iyi;Nāsa onwe-ha nime miri-ara-ehi, nānọdu n'akuku miri-iyi di iche iche juputara na miri.
13 Ǹtì-ya abua di ka nkpuru uda, dika ulo-elu nke nkpa-akwukwọ nēsì ísì utọ:Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua di ka urodi, nābusi myrrh nērù erù.