8 Ayi nwere otù nwa-nne nwayi di ntà,Ma ọ dighi ara ọ kpuru:Gini ka ayi gēmere nwa-nne-ayiN'ubọchi mb͕e agēkwu okwu-ya?
9 Ọ buru na ọ bu mb͕idi,Ayi gēwukwasi ya ulo-elu nke ọla-ọcha:Ma ọ buru na ọ bu ọnu-uzọ,Ayi gēji ibo cedar mechibido ya.
10 Mu onwem bu mb͕idi, aram abua di kwa ka ulo-elu-ya:Mb͕e ahu adim n'anya-ya dika onye nāchọta udo.
11 Solomon nwere ubi-vine nime Beal-hamon;Ọ nyere ubi-vine ahu n'aka ndi-nche;Onye ọ bula n'ọnọdu nkpuru-ya gēweta nnù ego ọla-ọcha abua na ọgu iri.
12 Ubi-vine nkem, nke m'nwere, di n'irum:Nnù abua na ọgu iri ahu gādiri gi, Solomon,Ọgu iri gādi-kwa-ra ndi nēche nkpuru-ya.
13 Gi onye bi n'ubi ab͕ara ogige,Ndi ejikọtara gi na ha nāṅa nti olu-gi:Mem ka m'nuru ya.
14 B͕alaga, gi onye ihe-gi nātọm utọ,Yi kwa mb͕ada ma-ọbu nwa-eleN'elu ugwu nile nke uda di iche iche.