25 Ọ gākpọte kwa ike-ya na obi-ya imegide eze Ndida chiri oké usu-ndi-agha; eze Ndida gākpali kwa onwe-ya ibu agha chiri oké usu-ndi-agha nke di ike nke-uku: ma ọ gaghi-eguzo, n'ihi na ha gēchè èchìchè di iche iche imegide ya.
26 Ọzọ, ndi nēri ihe-oriri ọma ya gētipia ya, usu-ndi-agha-ya gērubiga ókè dika miri: ọtutu madu gāda kwa n'ala buru ndi eb͕uru eb͕u.
27 Ma eze abua ndia, obi-ha gādi n'ime ihe ọjọ, ọ bu kwa n'otù table ka ha gēkwu okwu-ugha: ma ọ gaghi-aga nke-ọma; n'ihi na ọgwugwu fọduru idi na mb͕e akara àkà.
28 Ọ gālaghachi kwa n'ala-ya n'àkù uku; obi-ya gābu kwa imegide ọb͕ub͕a-ndu nsọ; ọ gēme kwa ihe, laghachi n'ala-ya.
29 Na mb͕e akara àkà ka ọ gābiaghachi, ba na Ndida; ma ọ gaghi-adi na mb͕e ikpe-azu otù ọ diri na mbu.
30 Ma ub͕ọ Kitim gābia imegide ya; obi-ya ewe mebie emebi, o we laghachi, wesa ọb͕ub͕a-ndu nsọ ahu oké iwe, me ihe, laghachi, tugharia uche na ndi nārapu ọb͕ub͕a-ndu nsọ ahu.
31 Ogwe-aka ufọdu gēsite kwa n'akuku-ya guzo, me ka ebe nsọ ahu ghara idi nsọ, bú ebe ahu siri ike, ha gēwezuga kwa àjà-nsure-ọku ahu anēsure mb͕e dum, ha gēdo kwa ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu.