24 Ma mpi iri ndia, ọ bu n'ala-eze ahu ka eze iri gēsi bilie: eze ọzọ gēbili kwa n'azu ha; ma ya onwe-ya gāpu iche n'aru ndi buru ya uzọ, eze atọ ka ọ gēme kwa ka ha di ala.
25 Ọzọ, okwu di iche iche megide Onye ahu nke kachasi ihe nile elu ka o gēkwu, ọ bu kwa ndi nsọ nke Onye ahu nke kachasi ihe nile elu ka ọ gēme ka ha ka nká: ọ gēle kwa anya ib͕anwe mb͕e di iche iche akara àkà na iwu; agēnye kwa ha n'aka-ya rue otù oge na oge abua na nkera oge.
26 Ma Onye-ikpe ahu gānọdu ala, ọ bu kwa ọchichi-ya ka agēme ka ọ gabiga, ikpochapu ya na ila ya n'iyì rue ọgwugwu ihe nile.
27 Ma ala-eze ahu, na ọchichi ahu, na idi-uku nke ala-eze nile n'okpuru elu-igwe nile, ka agēnye ndi ahu, bú ndi nsọ nke Onye ahu nke kachasi ihe nile elu: ala-eze-Ya bu ala-eze ebighi-ebi, ọchichi nile gēfè kwa Ya, nu olu-Ya.
28 N'ebe a ka ọgwugwu okwu a di. Ma mu onwem, bú Daniel, èchìchèm nile nēme ka m'ma jijiji nke-uku, ib͕u-maramara nke irum nāb͕anwe kwa n'arum: ma okwu ahu ka m'debere n'obim.