Daniel 7:4-10 IGBOB

4 Nke-mbu di ka ọdum, ọ nwe-kwa-ra nkù abua nke ugo: anọm nēle rue mb͕e ekwopuru nkù-ya abua, ewe si n'ala bulie ya elu, ọ bu kwa n'ukwu abua ka eguzobere ya ọtọ dika madu, ọ bu kwa obi madu ka enyere ya.

5 Ma le, anu ọzọ, nke mere ha abua, nke yiri bear, ma n'otù akuku ka emere ya ka o bilie, ọgiriga atọ di kwa n'ọnu-ya n'etiti ezé-ya: ọ bu kwa otú a ka ha nāsi ya, Bilie, rie ọtutu anu.

6 Mb͕e nka gasiri, anọm nāhu, ma, le, anu ọzọ, dika agu, ma o nwere nkù anọ nke anu-ufe n'azu-ya; ọ bu kwa isi anọ ka anu a nwere; anēnye kwa ya ọchichi.

7 Mb͕e nka gasiri m'nọ nāhu n'ọhù nile nke abali, ma le, otù anu, nke mere ha anọ, nke di egwu, nwe ume, dikarisiri ike; ọ nwe-kwa-ra ezé di uku nke ígwè: o ripiara ihe tapia kwa, ma nke fọduru, o jiri ukwu-ya zọtọ ya: anu ahu di kwa iche n'anu nile buru ya uzọ; o nwe-kwa-ra mpi iri.

8 Anọm nēlegide mpi iri ahu, ma, le, otù mpi ọzọ, nke di ntà, rigotara n'etiti ha, ewe ropu mpi atọ nime mpi iri mbu n'iru ya: ma, le, anya di iche iche, dika anya madu, di na mpi a, na otù ọnu nke nēkwu oké ihe di iche iche.

9 Anọm nāhu rue mb͕e atudasari oche-eze di iche iche, otù Onye ochie we nọdu ala: uwe-Ya di ọcha dika snow, agiri-isi nke isi-Ya di kwa ka aji-anu nwupuru enwupu; oche-eze-Ya bu ire ọku ire ọku, wheel-Ya nile bu ọku nēre ere.

10 Osimiri nke bu ọku nērùputa n'iru ya: orú nnù ndi-ozi ọgu uzọ isi na uzọ ise nējere Ya ozi, orú nnù orú nnù uzọ, na orú nnù nnù uzọ iri-na-otù, na orú nnù ọgu uzọ ise, nēguzo kwa ọtọ n'iru Ya: Onye-ikpe ahu nọduru ala, asaghe-kwa-ra akwukwọ di iche iche.