4 M'we hu, ma, le, oké ifufe nēsi n'Ugwu bia, oké igwe-oji, na ọku nke nānwude onwe-ya mb͕e nile, onwunwu di-kwa-ra ya buruburu, ọ bu kwa n'etiti ya, bú n'etiti ọku ahu, ka ihe dika amber n'ile ya anya nēb͕upu.
5 Ọzọ, n'etiti ya ka oyiyi nke ihe anọ di ndu si puta. Ma nka bu ka ha si di n'ile ha anya; oyiyi madu ka ha nwere.
6 Ọzọ, iru anọ ka onye ọ bula nime ha nwere, ọ bu kwa nkù anọ ka onye ọ bula nime ha nwere.
7 Ọzọ, ukwu nile ha bu ukwu guzoziri eguzozi; ọzọ, ọbu-ukwu nke ukwu nile ha di ka ọbu-ukwu nwa-ehi: ha neb͕u kwa maramara dika ib͕u-maramara ọla akwọchara akwọcha.
8 Ha nwe-kwa-ra aka madu n'okpuru nkù-ha n'akuku anọ ha: ọzọ, iru nile ha na nkù nile ha diri ha anọ otú a;
9 ihe ejikọtara ejikọta, otù na ibe-ya, ka nkù nile ha bu; ha adighi-agha anya n'azu mb͕e ha nāga; ha nāga n'iru, onye ọ bula na ncherita-iru ya.
10 Ma oyiyi iru nile ha, iru madu ka ha nwere; iru ọdum ka ha anọ nwe-kwa-ra n'aka-nri; iru ehi ka ha anọ nwe-kwa-ra n'aka-ekpe; iru ugo ka ha anọ nwe-kwa-ra.