Ezikiel 41 IGBOB

1 O we me ka m'biarue ulo uku Chineke, o we tùa akuku-ọnu-uzọ-ya, cubit isi n'obosara n'otù akuku, na cubit isi n'obosara n'akuku nke-ọzọ, nka bu obosara ulo-ikwū ahu.

2 Obosara nke ọnu-uzọ di kwa cubit iri; akuku abua nke ọnu-uzọ ahu di kwa cubit ise n'otù akuku, na cubit ise n'akuku nke-ọzọ: O we tùa ogologo-ya, ọgu cubit abua, na obosara-ya, orú cubit.

3 O we ba nime, tùa akuku-ọnu-uzọ ọ bula nke ọnu-uzọ ahu, cubit abua: na ọnu-uzọ, cubit ise; na obosara ọnu-uzọ, cubit asa.

4 O we tùa ogologo-ya, orú cubit, na obosara-ya, orú cubit, n'iru ulo uku Chineke: o we sim, Nka bu ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile.

5 O we tùa mb͕idi ulo ahu, cubit isi; na obosara nke ulo ntà nke akuku n'otù n'otù, cubit anọ, buruburu ulo ahu n'akuku nile ọ bula.

6 Ulo ntà nke akuku di kwa otù ulo ntà nke akuku n'elu ulo ntà nke akuku ọzọ okpukpu atọ, ha di kwa orú na iri n'usoro; ha we ba nime mb͕idi ahu nke diri ulo ahu bayere ulo ntà nke akuku di ya buruburu n'akuku nile, ka ha we jide mb͕idi ahu, ghara ijide mb͕idi ulo onwe-ya.

7 Ulo ntà nke akuku ndia di obosara kari ka ha nāla elu elu n'idi ulo ahu buruburu; n'ihi na idi ulo ahu buruburu nāla elu elu buruburu ulo ahu n'akuku nile: n'ihi nka obosara nke diri ulo ahu di uku kari n'elu; otú a anēsi n'ulo ntà di ala rigorue ulo ntà kachasi elu site n'ulo ntà di n'etiti.

8 M'we hu na ulo ahu nwere ebe di elu buruburu n'akuku nile: ntọ-ala nile nke ulo ntà nke akuku bu ogologo zuru ezu nke ami ahu eji atù ihe, bú cubit uku isi.

9 Ib͕idi nke mb͕idi ahu, nke diri ulo ntà nke akuku, n'èzí, di cubit ise: ma nke fọduru bu ọnọdu nke ulo ntà nke akuku nke diri ulo ahu.

10 N'etiti ime-ulo abua ọ di orú cubit n'obosara buruburu ulo ahu n'akuku nile ọ bula.

11 Ma ọnu-uzọ nke ulo ntà nke akuku chere iru n'ebe ahu fọduru, otù ọnu-uzọ n'uzọ nke Ugwu, na otù ọnu-uzọ n'akuku Ndida: obosara nke ebe ahu nke fọduru di kwa cubit ise buruburu n'akuku nile.

12 Ma ulo ahu anēwu ewu nke di n'iru ebe ekewapuru ekewapu n'akuku n'uzọ Ọdida-anyanwu, obosara-ya di ọgu cubit atọ na iri; mb͕idi nke ulo ahu anēwu ewu di kwa cubit ise n'ib͕idi-ya buruburu n'akuku nile, ogologo-ya di kwa ọgu cubit anọ na iri.

13 Ọ tù-kwa-ra ulo ahu, ogologo-ya di ọgu cubit ise; na ebe ahu ekewapuru ekewapu, na ulo ahu anēwu ewu, na mb͕idi-ya nile, ogologo-ya di ọgu cubit ise;

14 na obosara nke iru ulo ahu, na nke ebe ahu ekewapuru ekewapu chere iru n'Iru-anyanwu, ọgu cubit ise.

15 Ọ tù-kwa-ra ogologo nke ulo ahu anēwu ewu n'iru ebe ahu ekewapuru ekewapu nke di n'azu ya, na ulo-njeghari-ya n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ, ọgu cubit ise; na ulo uku Chineke nke ime-ime, na uzọ-nbata nile nke ogige ahu;

16 nbata-uzọ-ya nile, na window nile emechiri emechi, na ulo-njeghari-ya nile buruburu n'okpukpu atọ ha, nke di na ncherita-iru nbata-uzọ ahu, nke ihe-nmachita nke osisi di ya buruburu n'akuku nile, site kwa n'ala rue window nile; ma window nile bu nke ekpuchiri ekpuchi;

17 rue elu ọnu-uzọ, ọbuná rue ulo ime-ime ya, na n'èzí, ru kwa mb͕idi-ya nile buruburu n'akuku nile n'ime na n'èzí, n'ọtùtù-ha.

18 Ọ bu kwa ihe emeworo ka o yie cherubim na nkwu; otù nkwu di n'etiti cherub na cherub, iru abua ka cherub ọ bula nwere;

19 iru madu we che iru na nkwu ahu di n'otù akuku, iru nwa-ọdum che-kwa-ra iru na nkwu ahu nke di n'akuku nke-ọzọ: otú a ka emere ya n'ulo ahu nile buruburu n'akuku nile.

20 Site n'ala rue elu ọnu-uzọ-ya ka cherubim na nkwu nke emere eme di: otú a ka mb͕idi nke ulo uku Chineke di.

21 Ma ulo uku Chineke ahu, akuku-ọnu-uzọ-ya nwere akuku anọ ra nrata; na iru ebe nsọ ya, n'ile ya anya ọ di ka ulo uku Chineke si di n'ile ya anya.

22 Ebe-ichu-àjà-ya bu osisi, cubit atọ n'idi-elu-ya, ogologo-ya di kwa cubit abua: ọ nwe-kwa-ra nkuku-ya anọ; ogologo-ya na akuku-ya nile bu kwa osisi: o we gwam okwu, si, Nka bu table ahu nke di n'iru Jehova.

23 Ọ bu kwa ọnu-uzọ abua ka ulo uku Chineke na ebe nsọ ya nwere n'otù n'otù.

24 Ọ bu kwa ibo-ọnu-uzọ abua ka ọnu-uzọ ndia nwere n'otù n'otù, bú ibo-ọnu-uzọ abua nke nāga buruburu; ibo-ọnu-uzọ abua diri otù ọnu-uzọ, ibo-ọnu-uzọ abua di-kwa-ra ọnu-uzọ nke-ọzọ.

25 Ihe emere n'elu ha, bú n'elu ibo-ọnu-uzọ nile nke ulo uku Chineke, bu kwa cherubim na nkwu, dika nke emere n'elu mb͕idi-ya nile; nbata-uzọ nke osisi di kwa n'iru uzọ-nbata-ya n'èzí.

26 Window emechiri emechi na nkwu di kwa n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ, n'akuku nile nke uzọ-nbata: otù a ka ulo ntà akuku nile nke ulo ahu na nbata-uzọ-ya nile di.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48