Ezikiel 25 IGBOB

1 Okwu Jehova we ruem nti, si,

2 Nwa nke madu, che iru-gi n'ebe umu Amon nọ, bue amuma megida ha:

3 si umu Amon, Nurunu okwu nke Onye-nwe-ayi Jehova; Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na i siri, Ehe, megide ebe nsọm, mb͕e emere ya ka ọ ghara idi nsọ; na imegide ala Israel, mb͕e ọ tọb͕ọrọ n'efu; na imegide ulo Juda, mb͕e ha gara ije biri n'ala ọzọ:

4 n'ihi nka, le, M'gaje iwere gi nye umu Iru-anyanwu ibu ihe ha nwetara, ha gēdo kwa ebe-ulo-ikwū nile ha nime gi, me ebe-obibi nile ha nime gi; ndi ahu gēri nkpuru-gi, ọ bu kwa ndi ahu gāṅu miri-ara-ehi-gi.

5 M'gēme kwa ka Raba ghọ ebe-obibi nke camel, me kwa ka umu Amon ghọ ebe-nmakpu nke ìgwè ewu na aturu: unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

6 N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na i kuwo aka, zọ ukwu n'ala, ṅuria ọṅu na nleli-gi nile nime nkpuru-obi-gi megide ala Israel;

7 n'ihi nka, le, Mu onwem esetiwo akam n'aru gi, M'gēwere kwa gi nye ka i ghọrọ mba nile ihe-nluta-n'agha; M'gēbipu kwa gi n'aru ndi nile di iche iche, me ka i si n'ala nile la n'iyì: M'gēkpochapu gi: i we mara na Mu onwem bu Jehova.

8 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na Moab na Sia nāsi, Le, ulo Juda di ka mba nile;

9 n'ihi nka, le, M'gaje imeghe akuku Moab site n'obodo ahu nile, site n'obodo-ya nile nke di na nsọtu-ala-ya, nke bu ima-nma nke ala ahu, bú Bet-jeshimot, na Beal-meon, na Kiriataim,

10 nye umu Iru-anyanwu, tiyere umu Amon, M'gēwere kwa ya nye ka ọ buru ihe ha nwetara, ka ewe ghara icheta umu Amon n'etiti mba nile:

11 ọ bu kwa Moab ka M'gēme ihe nile ekpere n'ikpe; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

12 Otù a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na Edom emegidewo ulo Juda n'ibọ̀ ọ́bọ̀, na n'ihi na ikpe amawo ha nke-uku, ha we bọrọ onwe-ha ọbọ n'aru ha;

13 n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a, M'gēseti kwa akam n'aru Edom, bipu nime ya madu na anumanu, me ya nkpọnkpọ ebe site na Timan; ọbuná rue Dedan ka ha gāda na mma-agha.

14 M'gēsi kwa n'aka ndim, bú Israel, tukwasi Edom ibọ̀-ọ́bọ̀m; ha ewe me n'Edom dika iwem si di na dika ọnumam si di: ha ewe mara ibọ̀-ọ́bọ̀m; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

15 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na ndi Filistia emesowo Juda n'ibọ̀-ọ́bọ̀, bọ̀ ọ́bọ̀ na nlelì nke di nime nkpuru-obi-ha ibibi ya n'iro ebighi-ebi;

16 n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a, Le, M'gaje iseti akam n'aru ndi Filistia, bipu ndi Keret, me ka ndi ọnu-miri oké osimiri fọduru la n'iyì.

17 M'gēji kwa iba-nba nile nke ọnuma bọ̀ ha ọ́bọ̀ nile di uku; ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'gātukwasi ha ibọ̀-ọ́bọ̀m.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48