Ezikiel 20 IGBOB

1 O rue n'arọ nke-asa, n'ọnwa nke-ise, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, na ufọdu nime ndi-okenye Israel biara iju Jehova ase, ha we nọdu ala n'irum.

2 Okwu Jehova we ruem nti, si,

3 Nwa nke madu, gwa ndi-okenye Israel okwu, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: ọ̀ bu ijum ase ka unu onwe-unu nābia? Mu onwem nādi ndu, M'gaghi-ekwe ka unu juam ase ma-ọli; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

4 Ì gēkpe ha ikpe, nwa nke madu, ì gēkpe ha ikpe? me ka ha mara ihe-árú nile nke ndi bu nna-ha;

5 si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ubọchi M'rọputara Israel, M'we weliere nkpuru ulo Jekob akam, me ka ha maram n'ala Ijipt, M'we weliere ha akam, si, Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu;

6 n'ubọchi ahu ka M'weliri akam nye ha, ime ka ha si n'ala Ijipt puta ba n'ala nke M'ledoro nye ha, nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya, nke bu ima-nma nke ala nile:

7 M'we si ha, Tufuenu, onye ọ bula ihe-árú nile nke anya-ya abua, unu eji-kwa-la arusi nile nke Ijipt merua onwe-unu; Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

8 Ha we nupu isi n'okpurum, ha ekweghi kwa igem nti; ha etufughi, onye ọ bula ihe-árú nile nke anya-ya abua, ha arapughi kwa arusi nile nke Ijipt: M'we si na M'gāwukwasi ha ọnumam, imezu iwem megide ha n'etiti ala Ijipt.

9 Ma alurum ọlu n'ihi aham, ka ewe ghara ime ya ka ọ ghara idi nsọ n'anya mba nile, ndi ha onwe-ha nọ n'etiti ha, ndi M'mere ka ha maram n'anya-ha, n'ime ka ha si n'ala Ijipt puta.

10 M'we me ka ha si n'ala Ijipt puta, M'we me ka ha ba n'ọzara.

11 M'we nye ha ukpurum nile, me ka ha mara ikpém nile, nke madu gādi kwa ndu nime ha, ma o me ha.

12 Ọzọ, ubọchi-izu-ikem nile ka M'nye-kwa-ra ha, ighọ ihe-iriba-ama n'etiti Mu na ha, ka ha we mara na Mu onwem bu Jehova, Nke nēdo ha nsọ.

13 Ulo Israel we nupu isi n'okpurum n'ọzara: ọ bughi n'ukpurum nile ka ha jeghariri, ikpém nile ka ha ju-kwa-ra, bú nke madu gādi kwa ndu nime ha, ma o me ha; ubọchi-izu-ikem nile ka ha mere ka ha ghara idi nsọ ma-ọli: M'we si na M'gāwukwasi ha ọnumam n'ọzara, ime ka ha gwusia.

14 M'we lua ọlu n'ihi aham, ka ewe ghara ime ka ọ ghara idi nsọ n'anya mba nile, ndi M'mere ka ha si n'ala Ijipt puta n'anya-ha.

15 Ọzọ kwa, Mu onwem weliri akam nye ha n'ọzara, si, na M'gaghi-eme ka ha ba n'ala ahu nke M'nyere ha, nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya, ima-nma ka ọ buru ala nile;

16 n'ihi na ikpém nile ka ha juru, ma ukpurum nile, ha ejegharighi nime ha, ubọchi-izu-ikem nile ka ha me-kwa-ra ka ha ghara idi nsọ: n'ihi na arusi nile ha ka obi-ha nējeso.

17 Anyam we mere ha ebere ka M'ghara ibibi ha, emeghkwam ka ha gwusia n'ọzara.

18 M'we si umu-ha n'ọzara, Unu ejegharila n'ukpuru nile nke nna-unu-hà, unu edebe-kwa-la ikpé nile ha, unu eji-kwa-la arusi nile ha meru onwe-unu:

19 Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu; jegharianu n'ukpurum nile, debe-kwa-nu ikpém nile, me ha:

20 donu ubọchi-izu-ikem nile nsọ; ha gāghọ kwa ihe-iriba-ama n'etiti Mu na unu, ka unu we mara na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

21 Umu-ha we nupu isi n'okpurum; ha ejeghi ije n'ukpurum nile, ha edebeghi kwa ikpém nile ime ha, bú nke madu gādi ndu nime ha, ma o me ha; ubọchi-izu-ikem nile ka ha mere ka ha ghara idi nsọ: M'we si na M'gāwukwasi ha ọnumam, imezu iwem megide ha n'ọzara.

22 Ma eseghachirim akam, we lua ọlu n'ihi aham, ka ewe ghara ime ka ọ ghara idi nsọ n'anya mba nile, ndi M'mere ka ha puta n'anya-ha.

23 Mu onwem weli-kwa-ra ha akam n'ọzara, si, na M'gāchusa ha n'etiti mba nile, fesa ha n'ala nile;

24 n'ihi na ha emeghi ihem nile ekpere n'ikpe, ọ bu kwa ukpurum nile ka ha juru, ubọchi-izu-ikem nile ka ha me-kwa-ra ka ha ghara idi nsọ, ọ bu kwa n'iso arusi nile nke ndi bu nna-ha ka anya-ha di.

25 Ọzọ, enye-kwa-ram ha ukpuru di iche iche nke nādighi nma, na ikpe di iche iche nke ha nāgaghi-adi ndu nime ha;

26 M'we merua ha n'onyinye nile ha, n'ime ka nwa ọ bula nke nēmeghe àkpà-nwa mbu gabiga n'ọku, ka M'we me ka ha tọb͕ọrọ n'efu, ka ha we mara na Mu onwem bu Jehova.

27 N'ihi nka, gwa ulo Israel okwu, gi nwa nke madu, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ bu kwa na nka ka nna-unu-hà kwulurum, n'imekpu emekpu megidem.

28 N'ihi na mb͕e M'mere ka ha ba n'ala ahu, nke M'weliri akam elu inye ha, ha we hu ugwu ntà nile ọ bula di elu, na osisi nile ọ bula b͕ara ọhia, ha we chua àjà nile ha n'ebe ahu, nye nkpasu-iwe nke onyinye-ibiaru-nso-ha n'ebe ahu, do ihe-ísì-utọ nile ha n'ebe ahu, wusi àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha n'ebe ahu.

29 M'we si ha, Gini bu ebe a di elu ebe unu onwe-unu nābà? Ewe kpọ aha-ya Bama rue ta.

30 N'ihi nka si ulo Israel, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ̀ bu n'uzọ nke nna-unu-hà ka unu onwe-unu nēmeru onwe-unu? ọ̀ bu kwa ihe-árú nile ha ka unu nākwaso iko?

31 ọzọ, mb͕e unu nēbuli onyinye nile unu, mb͕e unu nēme ka umu-unu gabiga n'ọku, ọ̀ bu na unu onwe-unu nēmeru onwe-unu n'arusi nile unu, rue ta? ma Mu onwem, #M'gēkwe ka unu juam ase, ulo Israel? Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), M'gaghi-ekwe ka unu juam ase ma-ọli:

32 ma ihe ahu nke nābà nime mọ-unu, ọ gaghi-adi ma-ọli; ọ bu na unu onwe-unu nāsi, Ayi gādi ka mba nile, dika ab͕uru nile nke ala nile, ijere osisi na nkume ozi.

33 Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), n'ezie ọ bu aka di ike, ọ bu kwa ogwe-aka esetiri eseti, ọ bu kwa ọnuma awusiri awusi, ka M'gēji buru eze-unu:

34 M'gēji kwa aka di ike, ji kwa ogwe-aka esetiri eseti, ji kwa ọnuma awusiri awusi, me ka unu si na ndi nile di iche iche puta, chikọputa kwa unu n'ala nile ebe unu b͕asaworo:

35 M'gēme kwa ka unu bata n'ọzara nke ndi nile di iche iche, Mu na unu gēkpe kwa ikpe n'ebe ahu iru na iru.

36 Dika Mu na nna-unu-hà kpere ikpe n'ọzara nke ala Ijipt, otú a ka Mu na unu gēkpe ikpe; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

37 M'gēme kwa ka unu gabiga n'okpuru nkpa-n'aka, M'gēme kwa ka unu ba n'ihe-nkegide nke ọb͕ub͕a-ndum;

38 M'gāsachapu kwa ndi nānupu isi na ndi nējehie megidem n'etiti unu; n'ala ebe ha nọ dika ọbìa ka M'gēme ka ha si puta, ma ọ bughi n'ala Israel ka ha gābà: unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

39 Ma unu onwe-unu, ulo Israel, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Jenu, fè, onye ọ bula arusi-ya nile, ma emesia unu aghaghi igem nti: ma unu agaghi-eji onyinye nile unu na arusi nile unu me ka aha nsọm ghara idi nsọ ọzọ.

40 N'ihi na n'ugwu nsọm, n'ugwu nke ebe di elu nke Israel, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), n'ebe ahu ka ulo Israel nile, ka ọ ra, gēfèm n'ala-ha: n'ebe ahu ka ihe-ha gātọm utọ, ọ bu kwa n'ebe ahu ka M'gāchọ àjà-nbuli nile unu na nkpuru mbu nke ùtú nile unu, ha na ihe nsọ nile unu.

41 N'ísì utọ ka ihe-unu gātọm utọ, mb͕e M'mere ka unu si na ndi nile di iche iche puta, mb͕e M'chikọputara unu n'ala nile nke unu b͕asaworo nime ha; agēdokwam nsọ nime unu n'anya mba nile.

42 Unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'gēme ka unu ba n'ala Israel, n'ala ahu nke M'weliri akam elu iwere ya nye nna-unu-hà.

43 Unu gēcheta kwa n'ebe ahu uzọ nile unu, na omume nile unu, nke unu meruru onwe-unu nime ha; unu gāsọ kwa onwe-unu oyi n'iru unu n'ihi ihe ọjọ nile unu nke unu meworo.

44 Unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'mesoworo unu n'ihi aham, ọ bughi dika uzọ ọjọ nile unu si di, ọ bughi kwa dika omume nile unu nke bibiri ebibi, unu ulo Israel; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

45 Okwu Jehova we ruem nti, si,

46 Nwa nke madu, che iru-gi n'uzọ Ndida, me ka okwu-gi busa dika miri-ozuzo n'ebe Ndida di, bue amuma megide oké ọhia nke ọhia ahu di na Negeb;

47 si oké ọhia Negeb, Nuru okwu Jehova; Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, M'gaje isuye ọku nime gi, ọ gēripia kwa osisi ndu nile ọ bula na osisi nile ọ bula kpọrọ nku nke di nime gi: ire-ọku-ya nēnwu enwu, ọ gaghi-anyu anyu, ọ gāru kwa iru nile site na Negeb rue na Ugwu.

48 Anu-aru nile, bú madu, gāhu kwa na Mu onwem, bú Jehova, esuyewo ya: ọ gaghi-anyu anyu.

49 M'we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! ha nēkwu okwu bayerem, si, Ọ̀ bughi onye nātu ilu ilu ka ọ bu?

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48