Ezikiel 32 IGBOB

1 O rue, n'arọ nke-iri-na-abua, n'ọnwa nke-iri-na-abua, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si,

2 Nwa nke madu, buliere Fero, bú eze Ijipt, abù-ákwá, si ya, Nwa-ọdum nke mba nìle ka i yiworo: ma gi onwe-gi di ka ogologo anu n'oké osimiri nile; i we waputa n'osimiri-gi nile, ji ukwu-gi, b͕arua miri, zọrua osimiri nile ha.

3 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M'gāchiri nkpọkọta ọtutu ndi di iche iche b͕asa ub͕um n'elu gi; ha gādọgota kwa gi n'ub͕um.

4 M'gātusa kwa gi n'ala-gi, n'ọhia ka M'gētufu gi, me kwa ka anu-ufe nile nke elu-igwe bekwasi gi, M'gēme kwa ka anu-ọhia nke uwa nka nile riju afọ site n'anu-aru-gi.

5 M'gētiyekwasi kwa anu-aru-gi n'ugwu nile, were kwa idi-elu-gi mejue ndagwurugwu nile.

6 M'gēde kwa ọbara-gi n'ala dika miri, bú ebe i nēgwu miri, rue ugwu nile; ebe nile miri si erù gējuputa na gi.

7 Mb͕e M'nēmenyu gi, M'gēkpuchi elu-igwe, me ka kpakpando nile ha jie nji; anyanwu ka M'gēkpuchi n'igwe-oji, ọnwa agaghi-enye kwa ìhè-ya.

8 Ihe nile nke nēnye ìhè n'elu-igwe ka M'gēme ka ha jie nji n'elu gi, M'gētiyekwasi kwa ọchichiri n'ala-gi; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

9 M'gākpasu kwa obi nke ọtutu ndi di iche iche, mb͕e M'gēme ka ntipia-gi bia n'etiti mba nile, rue ala di iche iche nke i nāmaghi.

10 M'gēme kwa ka i ju ọtutu ndi anya, ndi-eze-ha gāma jijiji bayere gi nke-uku, mb͕e M'gēfeghari mma-agham n'iru ha; ha gāma kwa jijiji na ntabi-anya nile ọ bula, onye ọ bula n'ihi ndu-ya, n'ubọchi nke ọdida-gi.

11 N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mma-agha nke eze Babilon gābiakwasi gi.

12 ọ bu site na mma-agha nile nke ndi-dike ka M'gēme ka ìgwè ndi-gi da; ndi kariri mba nile n'ime ka madu ma jijiji ka ha nile bu: ọ bu kwa ihe-npako nke Ijipt ka ha gāpunara ya, ewe kpochapu ìgwè ndi-ya nile.

13 M'gēme kwa ka anumanu-ya nile si n'akuku ọtutu miri la n'iyì; ukwu madu agaghi-ab͕aru kwa ha ọzọ, ukwu anumanu agaghi-ab͕aru kwa ha.

14 Mb͕e ahu ka M'gēme ka miri-ha do, me kwa ka osimiri nile ha rùe erù dika manu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

15 Mb͕e m'gēme ala Ijipt ebe tọb͕ọrọ n'efu na ihe-iju-anya, ala b͕a aka n'ihe juru ya-ri, mb͕e M'gētib͕u ndi nile bi ya, ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

16 Abù-ákwá ka nka bu, nke ha gābù; umu-ndinyom nke mba nile gābù ya: n'ihi Ijipt na n'ihi ìgwè-ya nile ka ha gābù ya; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

17 O rue, n'arọ nke-iri-na-abua, n'ubọchi nke-iri-na-ise ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si,

18 Nwa nke madu, bùara ìgwè ndi Ijipt abù ákwá, me ka ha rida, ya na umu-ndinyom nke mba di iche iche di ebube, rue ala di n'okpuru uwa, ha na ndi nārida n'olùlù.

19 Ònye ka i tọkariri n'utọ? rida, ka eme kwa ka i soro ndi anēbighi úgwù dina.

20 N'etiti ndi ejiri mma-agha b͕u ka ha gāda: ewerewo ya nye mma-agha: kpupunu ya na ìgwè ndi-ya nile.

21 Ndi di ike nke ndi-dike gēsi n'etiti ala-mọ gwa ya okwu, ha na ndi nēyere ya aka: ha aridawo, ha edinawo ala, bú ndi anēbighi úgwù, ndi ejiri mma-agha b͕u.

22 N'ebe ahu ka Asiria na nkpọkọta ndi ya nile di; n'ebe nile di ya buruburu ka ílì-ya nile di: ha nile bu ndi eb͕uru eb͕u, ndi daworo site na mma-agha:

23 ndi etiyere ílì nile ha na nsọtu nile nke olùlù, nkpọkọta ndi-ya di ílì-ya buruburu: ha nile bu ndi eb͕uru eb͕u, ndi daworo site na mma-agha, bú ndi mere ka ujọ di n'ala ndi di ndu.

24 N'ebe ahu ka Ilam na ìgwè ndi-ya nile ndi nọ ílì-ya buruburu di: ha nile bu ndi eb͕uru eb͕u, ndi daworo site na mma-agha, ndi ridara n'ebighi-úgwù rue ala di n'okpuru uwa, bú ndi mere ka ujọ-ha di n'ala ndi di ndu, we būru ihere-ha, ha na ndi nārida n'olùlù.

25 N'etiti ndi eb͕uru eb͕u ka ha nyeworo ya ihe-ndina n'etiti ìgwè ndi-ya nile; n'ebe nile di ya buruburu ka ílì-ya nile di: ha nile bu ndi anēbighi úgwù, ndi ejiri mma-agha b͕u; n'ihi na emere ka ujọ-ha di n'ala ndi di ndu, ha we būru ihere-ha, ha na ndi nārida n'olùlù: n'etiti ndi eb͕uru eb͕u ka etiyeworo ya.

26 N'ebe ahu ka Meshek na Tubal na ìgwè ndi-ya nile nọ; n'ebe nile nke di ya buruburu ka ílì-ya nile di: ha nile bu ndi anēbighi úgwù, ndi ejiri mma-agha b͕u; n'ihi na ha mere ka ujọ-ha di n'ala ndi di ndu.

27 Ha agaghi-esoro ndi-dike dina, bú ndi dara ada site na ndi anēbighi úgwù, ndi ridaworo n'ala-mọ chiri ihe-agha-ha, ha we tọb͕ọrọ mma-agha-ha n'okpuru isi-ha, ajọ omume nile ha dikwasi n'ọkpukpu-ha; n'ihi na ujọ ndi-dike ka ha bu n'ala ndi di ndu.

28 Ma gi onwe-gi, n'etiti ndi anēbighi úgwù ka agētipia gi, i gēso kwa ndi ejiri mma-agha b͕u dina.

29 N'ebe ahu ka Edom na ndi-eze-ya na ndi-isi-ya nile nọ, ndi atọb͕ọworo n'idi-ike-ha n'etiti ndi ejiri mma-agha b͕u: ndi ahu gēsoro ndi anēbighi úgwù, so kwa ndi nārida n'olùlù, dina.

30 N'ebe ahu ka ndi-isi Ugwu nọ, ha nile, na ndi Zaidon nile, ndi soro ndi eb͕uru eb͕u rida; n'ujọ-ha nke ha mere ka atua site n'idi-ike-ha ka ihere nēme ha; ha ewe soro ndi ejiri mma-agha b͕u dina n'ebighi-úgwù, būru ihere-ha, ha na ndi nārida n'olùlù.

31 Ndi ahu ka Fero gāhu, ewe kasie ya obi bayere ìgwè ndi-ya nile: ha bu ndi ejiri mma-agha b͕u, bú Fero na usu-ndi-agha-ya nile; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

32 N'ihi na emewom ka ujọ-ya di n'ala ndi di ndu: agēme kwa ka o dina n'etiti ndi anēbighi úgwù, ya na ndi ejiri mma-agha b͕u, bú Fero na ìgwè ndi-ya nile; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48