1 Okwu Jehova we ruem nti, si,
2 Nwa nke madu, n'etiti ulo nnupu-isi ahu ka i bi, bú ndi nwere anya ihu uzọ, ma ha ahughi, ndi nwere nti inu ihe, ma ha anughi; n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.
3 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, mere onwe-gi ihe di iche iche nke ndi anēme ka ha je biri n'ala ọzọ, je biri n'ala ọzọ n'ehihie n'anya-ha; i gēsi kwa n'ọnọdu-gi je biri n'ebe ọzọ n'anya-ha: eleghi anya ha gāhu, n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.
4 I gēbuputa kwa ihe-gi nile n'ehihie n'anya-ha, dika ihe nke ndi anēme ka ha je biri n'ala ọzọ: gi onwe-gi gāpu kwa n'anyasi n'anya-ha, dika ọpupu nke ndi anēme ka ha je biri n'ala ọzọ.
5 Gwupuere onwe-gi mb͕idi n'anya-ha, si n'ebe ahu bupu ihe.