9 Nwa nke madu, hà asighi gi, bú ulo Israel, ulo nke nnupu-isi ahu, Gini ka gi onwe-gi nēme?
10 Si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Onye-isi nke nọ na Jerusalem ka eboro ibu a, ya na ulo Israel nile nke ndi ahu nọ n'etiti ha.
11 Si, Mu onwem bu ihe-ebube-unu: dika m'meworo, otú a ka agēme ha: ọ bu n'ime ka ha je biri n'ala ọzọ, n'idọta ha n'agha, ka ha gāla.
12 Onye-isi ahu kwa nke nọ n'etiti ha, n'ubu-ya ka o gēbu ihe n'ọchichiri, we pua: mb͕idi ka ha gēgwupú isi na ya bupu ihe: iru-ya ka o gēkpuchi, n'ihi na ya onwe-ya agaghi-eji anya-ya hu ala ahu.
13 M'gāb͕asa kwa ub͕um n'aru ya, agāma kwa ya n'ọnyàm: M'gēme kwa ka ọ biarue Babilon, bú ala ndi Kaldea; ma ala ahu ka ọ nāgaghi-ahu, ma n'ebe ahu ka ọ gānwu.
14 Ọ bu kwa ndi nile ndi di ya buruburu iyere ya aka, na usu-ndi-agha-ya nile, ka M'gēfesara ifufe nile ọ bula; ọ bu kwa mma-agha ka M'gāmiputa n'azu ha.
15 Ha gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'gāchusa ha n'etiti mba nile, fesa kwa ha n'ala nile.