1 Ufọdu nime ndi-okenye Israel we biakutem, nọdu ala n'irum.
2 Okwu Jehova we ruem nti, si,
3 Nwa nke madu, ndikom ndia emewo ka arusi nile ha ba n'obi-ha, ọ bu kwa ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume-ha ka ha tiyere na ncherita-iru ha: #M'gēkwe ka ha juam ase ma-ọli?
4 N'ihi nka gwa ha okwu, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Onye ọ bula n'ulo Israel nke nēme ka arusi nile ya ba n'obi-ya, nke nētiye kwa ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume-ya na ncherita-iru ya, we biakute onye-amuma; Mu onwem, bú Jehova, gāza ya dika o si di, ya bu dika iba-uba nke arusi-ya nile si di;
5 ka M'we jide ulo Israel n'obi-ha, n'ihi na ha esiwo n'ebe M'nọ ghọ ndi ala ọzọ site n'arusi nile ha.
6 N'ihi nka si ulo Israel, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Latanu, sinu n'arusi nile unu chigharia; si-kwa-nu n'ihe-árú nile unu chigharia iru-unu.
7 N'ihi na onye ọ bula n'ulo Israel, ma-ọbu onye ọ bula nime ndi-ọbìa nke nọ dika ọbìa n'Israel, nke nēkewapu onwe-ya n'isom, we me ka arusi nile ya ba n'obi-ya, nke nētiye kwa ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume-ya na ncherita-iru ya, we biakute onye-amuma iju ase bayerem n'aka ya; Mu onwem, bú Jehova, gāza ya n'Onwem: