38 M'gēkpe kwa gi ikpe nile nke ndi bu nwunye nākwa iko, ndi nāwusi kwa ọbara; M'gēwere kwa gi nye ka i buru ọbara nke ọnuma na nke ekworo.
39 M'gēnye kwa gi n'aka-ha, ha ewe kwatue ulo ikwa-iko gi, tikpọ ebe-gi nile di elu, yipu uwe-gi nile n'aru-gi, chiri ihe-gi nile mara nma: ha gārapu gi i b͕arasia ọtọ.
40 Ha gēme kwa ka nkpọkọta rigota imegide gi, ha gēwere kwa nkume tub͕ue gi, were mma-agha-ha dupue gi.
41 Ha gēsure kwa ulo-gi nile n'ọku, meso gi ihe nile ekpere n'ikpe n'anya ọtutu ndinyom; M'gēme kwa ka i kwusi ikwa iko; ọzọ, i gaghi-enye kwa onyinye ọzọ.
42 M'gēme kwa ka ọnumam zuru ike n'aru gi, ekworom gēsi kwa n'aru gi wezuga onwe-ya, M'gānọ kwa jū, ghara iwe iwe ọzọ.
43 N'ihi na i chetaghi ubọchi nile nke mb͕e i di na nwata, i we mekpam aru n'ihe ndia nile; n'ihi ya, le, Mu onwem gētiyekwasi kwa uzọ-gi n'isi-gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): ì meghi kwa ajọ ihe-nzube a tukwasi n'ihe-árú-gi nile?
44 Le, onye ọ bula nātu ilu gātu ilu bayere gi, si, Dika nne si di, otú a ka nwa-ya nwanyi di.