40 Ha gēme kwa ka nkpọkọta rigota imegide gi, ha gēwere kwa nkume tub͕ue gi, were mma-agha-ha dupue gi.
41 Ha gēsure kwa ulo-gi nile n'ọku, meso gi ihe nile ekpere n'ikpe n'anya ọtutu ndinyom; M'gēme kwa ka i kwusi ikwa iko; ọzọ, i gaghi-enye kwa onyinye ọzọ.
42 M'gēme kwa ka ọnumam zuru ike n'aru gi, ekworom gēsi kwa n'aru gi wezuga onwe-ya, M'gānọ kwa jū, ghara iwe iwe ọzọ.
43 N'ihi na i chetaghi ubọchi nile nke mb͕e i di na nwata, i we mekpam aru n'ihe ndia nile; n'ihi ya, le, Mu onwem gētiyekwasi kwa uzọ-gi n'isi-gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): ì meghi kwa ajọ ihe-nzube a tukwasi n'ihe-árú-gi nile?
44 Le, onye ọ bula nātu ilu gātu ilu bayere gi, si, Dika nne si di, otú a ka nwa-ya nwanyi di.
45 Nwa-nwanyi nke nne-gi ka i bu, nke nāsọ di-ya na umu-ya oyi; ọ bu kwa nwa-nne nke umu-nne-gi ndinyom ka i bu, ndi sọrọ di-ha na umu-ha oyi: nne-unu bu onye Het, nna-unu bu kwa onye-Amorait.
46 Nwa-nne-gi nwanyi nke-okenye bu Sameria, nke bi n'aka-ekpe-gi, ya onwe-ya na umu-ya ndinyom: nwa-nne-gi nwanyi nke-ntà, nke bi n'aka-nri-gi, bu Sọdọm na umu-ya ndinyom.