42 M'gēme kwa ka ọnumam zuru ike n'aru gi, ekworom gēsi kwa n'aru gi wezuga onwe-ya, M'gānọ kwa jū, ghara iwe iwe ọzọ.
43 N'ihi na i chetaghi ubọchi nile nke mb͕e i di na nwata, i we mekpam aru n'ihe ndia nile; n'ihi ya, le, Mu onwem gētiyekwasi kwa uzọ-gi n'isi-gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): ì meghi kwa ajọ ihe-nzube a tukwasi n'ihe-árú-gi nile?
44 Le, onye ọ bula nātu ilu gātu ilu bayere gi, si, Dika nne si di, otú a ka nwa-ya nwanyi di.
45 Nwa-nwanyi nke nne-gi ka i bu, nke nāsọ di-ya na umu-ya oyi; ọ bu kwa nwa-nne nke umu-nne-gi ndinyom ka i bu, ndi sọrọ di-ha na umu-ha oyi: nne-unu bu onye Het, nna-unu bu kwa onye-Amorait.
46 Nwa-nne-gi nwanyi nke-okenye bu Sameria, nke bi n'aka-ekpe-gi, ya onwe-ya na umu-ya ndinyom: nwa-nne-gi nwanyi nke-ntà, nke bi n'aka-nri-gi, bu Sọdọm na umu-ya ndinyom.
47 Ma ọ bughi n'uzọ di iche iche ha ka i jeworo ije, ọ bughi kwa dika ihe-árú nile ha si di ka i meworo; kama, dika agāsi na nke ahu bu nọ̄ ihe ntà, i we bibie onwe-gi kari ha n'uzọ-gi nile.
48 Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), Sọdọm, bú nwa-nne-gi nwanyi, emeghi, ya onwe-ya ma-ọbu umu-ya ndinyom, otú i meworo, gi onwe-gi na umu-gi ndinyom.