8 nke nādighēnye ego ka ọ nara uma, nke nādighi-anara ọmuru-nwa, nke nēsi n'ajọ omume seghachi aka-ya, nke nēme ihe ekpere n'ezi-okwu n'etiti madu na madu,
9 nke nējeghari n'ukpurum nile, nke debeworo ikpém nile, ime ihe n'ezi-okwu; onye ezi omume ka onye ahu bu, ọ ghaghi idi ndu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
10 Asi na ọ muwo nwa nke bu onye nke nēme ihe-ike, onye nāwusi ọbara, nke nēme otù ihe ọ bula n'ihe ndia,
11 ma ezi ihe ndia nile ka ọ nēmeghi, n'ihi na ọbuná n'ugwu ka o riworo ihe, ọ bu kwa nwunye madu-ibe-ya ka o meruworo,
12 onye ewedara n'ala na ob͕eye ka o meworo ihe-ike, ọ punarawo madu ihe n'ike, ọ dighi-enyeghachi ihe-ibe, ọ bu kwa arusi nile ka o weliworo anya-ya abua le, ihe-árú ka o meworo,
13 n'uma ka o nyeworo ego, ọ bu kwa ọmuru-nwa ka ọ naraworo: ọ̀ gādi kwa ndu? ọ gaghi-adi ndu: ihe-árú ndia nile ka o meworo: aghaghi ime ka ọ nwua; ọbara-ya gādi ya n'isi.
14 Ma, le, asi na ọ muwo nwa, o we hu nmehie nile nke nna-ya, nke o meworo, o we tua egwu, ghara ime ihe dika ihe ndia,