12 Tie nkpu, kwasie ákwá ike, nwa nke madu: n'ihi na nke ahu di n'aru ndim, nke ahu di n'aru ndi-isi Israel: ndi arara nye mma-agha ka ha na ndim bu: n'ihi nka tie aka n'apata-ukwu-gi.
13 N'ihi na ọnwunwa di; gini gēme kwa ma ọ buru na ọbuná nkpa-n'aka nke nāju aju ghara idi? ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
14 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, bue amuma, kukọta ọbu-aka-gi abua; ka mma-agha di okpukpu atọ, bú mma-agha nke ndi anēb͕u eb͕u: nke ahu bu mma-agha nke onye uku ahu nke anēb͕u eb͕u, nke nāb͕achibido ha buruburu.
15 Ọ bu n'akuku ọnu-uzọ-ama nile ha ka M'tiyeworo ọnu-ọnu mma-agha, ka obi we lọ ha miri, ka ewe me kwa ka ihe-isu-ngọngọ ba uba: ewó! emewo ya ka ọ ghọ àmùmà, amuru ya amu ib͕u eb͕u.
16 Me onwe-gi ka i di otù, ga n'aka-nri; do onwe-gi n'usoro, ga n'akpa-ekpe; ebe ọ bula akaworo iru-gi àkà iga.
17 Ọzọ, Mu onwem gākukọta kwa ọbu-akam abua, M'gēme kwa ka ọnumam zuru ike: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo.
18 Okwu Jehova we ruem nti, si,