17 Juda na ala Israel, ndi ahu bu ndi-ahia-gi: ọka wheat nke Minit, na pannag, na manu-aṅu, na manu, na balm, ka ha jiri zu ihe-ahia-gi.
18 Damaskọs bu onye-ahia-gi n'ihi iba-uba nke i mere ire ere, site n'iba-uba nke àkù nile ọ bula; o jiri manya-vine Helbon na aji-anu di ọcha zu.
19 Vedan na Jevan nēwere ogho aturu atu zua ihe-ahia-gi nile: ígwè nwupuru enwupu, na cassia, na calamus, adiwo n'etiti ihe-izu-ahia-gi.
20 Dedan bu onye-ahia-gi n'ákwà sara mbara iji nọkwasi inyinya.
21 Arebia na ndi-isi nile nke Kida, ndi ahu bu ndi-ahia nke aka-gi; n'umu-aturu na ebulu na ewu, n'ihe ndia ka ha bu ndi-ahia-gi.
22 Ndi-ahia nke Sheba na Reama, ndi ahu bu ndi-ahia-gi: ha jiri uda kachasi uda nile nma, ji kwa nkume nile nke di oké ọnu-ahia, na ọla-edo, zua ihe-ahia-gi nile.
23 Heran na Kane na Eden, ndi-ahia Sheba, Asiria, Kilmad, ndia bu ndi-ahia-gi.