20 Dedan bu onye-ahia-gi n'ákwà sara mbara iji nọkwasi inyinya.
21 Arebia na ndi-isi nile nke Kida, ndi ahu bu ndi-ahia nke aka-gi; n'umu-aturu na ebulu na ewu, n'ihe ndia ka ha bu ndi-ahia-gi.
22 Ndi-ahia nke Sheba na Reama, ndi ahu bu ndi-ahia-gi: ha jiri uda kachasi uda nile nma, ji kwa nkume nile nke di oké ọnu-ahia, na ọla-edo, zua ihe-ahia-gi nile.
23 Heran na Kane na Eden, ndi-ahia Sheba, Asiria, Kilmad, ndia bu ndi-ahia-gi.
24 Ndi ahu bu ndi-ahia-gi n'ihe di iche iche mazuru nma, n'ulo ákwà anunu na ákwà akpara nke-ọma, na n'ib͕e juputara n'uwe turu agwa nke-ọma, nke eji udọ̀ ke were kwa osisi cedar me ha, n'etiti ihe-ahia-gi.
25 Ub͕ọ nile nke Tashish bu usu-ndi-ahia-gi iweta ihe-izu-ahia-gi: i we ju eju, di nsọpuru nke-uku n'etiti oké osimiri nile.
26 Ọ bu ọtutu miri ka ndi nānyà gi meworo gi ka i ba: ifufe Iru-anyanwu etiwawo gi n'etiti oké osimiri nile.