25 Ub͕ọ nile nke Tashish bu usu-ndi-ahia-gi iweta ihe-izu-ahia-gi: i we ju eju, di nsọpuru nke-uku n'etiti oké osimiri nile.
26 Ọ bu ọtutu miri ka ndi nānyà gi meworo gi ka i ba: ifufe Iru-anyanwu etiwawo gi n'etiti oké osimiri nile.
27 Àkù-gi, na ihe-ahia-gi nile, na ihe-izu-ahia-gi, na ndi-ọ̀kà-ub͕ọ-gi, na ndi nākwuchi oghere-ub͕ọ-gi, na ndi nāzu ahia-gi, na ndi-agha-gi nile, ndi nọ nime gi, na nime nkpọkọta-madu nile nke gi nke di n'etiti gi, gādabà n'etiti oké osimiri nile n'ubọchi ọdida-gi.
28 N'olu iti-nkpu nke ndi-ọ̀kà-ub͕ọ-gi azu-obodo-gi nile gēme nkpatu.
29 Ndi nile ndi nānya umara, na ndi-ub͕ọ, na ndi-ọ̀kà-ub͕ọ nile nke oké osimiri, gēsi kwa n'ub͕ọ-ha ridata, n'elu ala ka ha gēguzo,
30 me ka anuru olu-ha n'elu gi, tie nkpu ilu, kpokwasi ájá n'isi-ha, na ntu ka ha gāturu onwe-ha:
31 ha gēme-kwa-ra onwe-ha isi-nkwọcha n'ihi gi, ke ákwà-nkpe n'úkwù, kwara gi ákwá n'idi-ilu nke nkpuru-obi n'iti-aka-n'obi di ilu.