6 n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N'ihi na i doworo obi-gi ka obi Chineke,
7 n'ihi nka, le, M'gēme ka ndi ala ọzọ biakwasi gi, bú ndi kachasi mba nile n'ime ka madu ma jijiji: ha gāmiputa kwa mma-agha-ha imegide ima-nma nke amam-ihe-gi, me ka onwunwu-ìhè-gi ghara idi nsọ.
8 Rue olùlù ka ha gēme ka i rida; i gānwu kwa ọnwu nke ndi eb͕uru eb͕u, n'etiti oké osimiri nile.
9 Ì gāsi n'ezie, Chineke ka m'bu, n'iru onye nēb͕u gi? ma gi onwe-gi bu madu, i bughi Chineke, n'aka onye nēme gi ka i ghara idi nsọ.
10 Ọnwu nke ndi anēbighi úgwù ka i gānwu site n'aka ndi ala ọzọ: n'ihi na Mu onwem ekwuwo okwu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
11 Okwu Jehova we ruem nti, si,
12 Nwa nke madu, buliere eze Taia abù-ákwá, si ya, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Gi onwe-gi bu onye nākachi ọtùtù-ihe akàrà, nke juputara n'amam-ihe, mazu kwa nma.