1 Okwu Jehova we ruem nti, si,
2 Nwa nke madu, bue amuma, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Kwasienu ákwá ike, si, Azib͕a ub͕ochi ahu!
3 N'ihi na ubọchi di nso, ọ di nso, bú ubọchi Jehova nwere, ọ bu ubọchi igwe-oji; mb͕e nke mba di iche iche ka ọ gābu.
4 Mma-agha gābiakwasi kwa n'Ijipt, ihe-nb͕ali gādi kwa n'Etiopia, mb͕e ndi eb͕uru eb͕u gāda n'Ijipt; ha ewe chipu ìgwè ndi-ya, kwatue ntọ-ala-ya nile.