13 Mb͕e M'nāsi onye ezi omume, na ọ ghaghi idi ndu, onye ahu ewe tukwasi obi n'ezi omume-ya, me ajọ omume, ezi omume-ya nile, agaghi-echeta ha; ma n'ajọ omume-ya nke o meworo, nime ya ka ọ gānwu.
14 Ọzọ, mb͕e M'nāsi onye nēmebi iwu, I ghaghi inwu; o we si na nmehie-ya chigharia, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume;
15 asi na onye nēmebi iwu enyeghachi ihe-ibe, kwughachi ihe ọ punara madu n'ike, jegharia n'ukpuru nile nke ndu, ghara ime ajọ omume; ọ ghaghi idi ndu, ọ gaghi-anwu.
16 Nmehie-ya nile nke o mehieworo agaghi-echeta ha megide ya: ihe ekpere n'ikpe na ezi omume ka o meworo; ọ ghaghi idi ndu.
17 Ma umu ndim asiwo, Adighi-atule uzọ Onye-nwe-ayi: ma ha onwe-ha, uzọ-ha ka anādighi-atule.
18 Mb͕e onye ezi omume si n'ezi omume-ya chigharia, me ajọ omume, ọ gānwu kwa nime ha.
19 Ma mb͕e onye nēmebi iwu si na nmebi-iwu-ya chigharia, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, n'ihi ihe ndia ka onye ahu gādi ndu.